1
Ilu 11:25
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 11:25
2
Ilu 11:24
Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
Nyochaa Ilu 11:24
3
Ilu 11:2
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
Nyochaa Ilu 11:2
4
Ilu 11:14
Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
Nyochaa Ilu 11:14
5
Ilu 11:30
Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
Nyochaa Ilu 11:30
6
Ilu 11:13
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
Nyochaa Ilu 11:13
7
Ilu 11:17
Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
Nyochaa Ilu 11:17
8
Ilu 11:28
Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
Nyochaa Ilu 11:28
9
Ilu 11:4
Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
Nyochaa Ilu 11:4
10
Ilu 11:3
Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
Nyochaa Ilu 11:3
11
Ilu 11:22
Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
Nyochaa Ilu 11:22
12
Ilu 11:1
Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu ONYENWE ANYị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
Nyochaa Ilu 11:1
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị