1
Ilu 10:22
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ngọzị ONYENWE ANYị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 10:22
2
Ilu 10:19
Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
Nyochaa Ilu 10:19
3
Ilu 10:12
Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
Nyochaa Ilu 10:12
4
Ilu 10:4
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
Nyochaa Ilu 10:4
5
Ilu 10:17
Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
Nyochaa Ilu 10:17
6
Ilu 10:9
Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
Nyochaa Ilu 10:9
7
Ilu 10:27
Ịtụ egwu ONYENWE ANYị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
Nyochaa Ilu 10:27
8
Ilu 10:3
ONYENWE ANYị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
Nyochaa Ilu 10:3
9
Ilu 10:25
Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
Nyochaa Ilu 10:25
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị