1
Ilu 18:21
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 18:21
2
Ilu 18:10
Aha ONYENWE ANYị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Nyochaa Ilu 18:10
3
Ilu 18:24
Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
Nyochaa Ilu 18:24
4
Ilu 18:22
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka ONYENWE ANYị.
Nyochaa Ilu 18:22
5
Ilu 18:13
Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
Nyochaa Ilu 18:13
6
Ilu 18:2
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
Nyochaa Ilu 18:2
7
Ilu 18:12
Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
Nyochaa Ilu 18:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị