1
Ilu 3:5-6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Tụkwasị ONYENWE ANYị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 3:5-6
2
Ilu 3:7
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
Nyochaa Ilu 3:7
3
Ilu 3:9-10
Sọpụrụ ONYENWE ANYị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
Nyochaa Ilu 3:9-10
4
Ilu 3:3
Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
Nyochaa Ilu 3:3
5
Ilu 3:11-12
Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
Nyochaa Ilu 3:11-12
6
Ilu 3:1-2
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
Nyochaa Ilu 3:1-2
7
Ilu 3:13-15
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
Nyochaa Ilu 3:13-15
8
Ilu 3:27
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
Nyochaa Ilu 3:27
9
Ilu 3:19
Ọ bụ site nʼamamihe ka ONYENWE ANYị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
Nyochaa Ilu 3:19
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị