1
Abụ Ọma 119:105
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 119:105
2
Abụ Ọma 119:11
Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.
Nyochaa Abụ Ọma 119:11
3
Abụ Ọma 119:9
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
Nyochaa Abụ Ọma 119:9
4
Abụ Ọma 119:2
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
Nyochaa Abụ Ọma 119:2
5
Abụ Ọma 119:114
Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.
Nyochaa Abụ Ọma 119:114
6
Abụ Ọma 119:34
Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.
Nyochaa Abụ Ọma 119:34
7
Abụ Ọma 119:36
Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.
Nyochaa Abụ Ọma 119:36
8
Abụ Ọma 119:71
Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.
Nyochaa Abụ Ọma 119:71
9
Abụ Ọma 119:50
Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.
Nyochaa Abụ Ọma 119:50
10
Abụ Ọma 119:35
Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
Nyochaa Abụ Ọma 119:35
11
Abụ Ọma 119:33
O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.
Nyochaa Abụ Ọma 119:33
12
Abụ Ọma 119:28
Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
Nyochaa Abụ Ọma 119:28
13
Abụ Ọma 119:97
O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
Nyochaa Abụ Ọma 119:97
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị