1
Abụ Ọma 19:14
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Kwere ONYENWE ANYị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 19:14
2
Abụ Ọma 19:7
Iwu ONYENWE ANYị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ ONYENWE ANYị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
Nyochaa Abụ Ọma 19:7
3
Abụ Ọma 19:1
Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
Nyochaa Abụ Ọma 19:1
4
Abụ Ọma 19:8
Iwu ONYENWE ANYị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu ONYENWE ANYị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
Nyochaa Abụ Ọma 19:8
5
Abụ Ọma 19:9
Ịtụ egwu ONYENWE ANYị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke ONYENWE ANYị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
Nyochaa Abụ Ọma 19:9
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị