1
ỌPUPU 6:6
Bible Nso
N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa ỌPUPU 6:6
2
ỌPUPU 6:7
M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.
Nyochaa ỌPUPU 6:7
3
ỌPUPU 6:8-9
M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova. Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.
Nyochaa ỌPUPU 6:8-9
4
ỌPUPU 6:1
Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya.
Nyochaa ỌPUPU 6:1
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị