Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;
E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:
Anya di elu, na ire okwu-ugha,
Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,
Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;
Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,
Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.