1
ABÙ ỌMA 1:1-2
Bible Nso
Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò. Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa ABÙ ỌMA 1:1-2
2
ABÙ ỌMA 1:3
Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.
Nyochaa ABÙ ỌMA 1:3
3
ABÙ ỌMA 1:6
N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume: Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.
Nyochaa ABÙ ỌMA 1:6
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị