Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Job 26

26
Okwu Job
1Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
2“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!
Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
3Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!
Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
4Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?
Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
5“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,
ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
6Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;
mbibi#26:6 Maọbụ, Abadọn nʼasụsụ Hibru tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.
7Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.
O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
8Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,
ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
9Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,#26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa
na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
10O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,
ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
11Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,
tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
12Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;
ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
13Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;
aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
14Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;#26:14 Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme
lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!
Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda#26:14 Egbe eluigwe nke ike nke ike ya?”

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Job 26: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye