Jona Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Jona bụ onye amụma Chineke kpọrọ zie ka ọ gaa zisaara ndị Ninive, obodo ukwu nke Asịrịa oziọma, banyere ikpe ọmụma nke na-aga ịdakwasị ha. Mgbe Jona nụrụ ozi a, ọ jụrụ ịga ebe Chineke ziri ya ka ọ gaa. Kama o mere ngwangwa chọọ isite nʼihu Chineke gbapụ. Ọ gbabanyere nʼụgbọ mmiri. Ma e si nʼebe ahụ tụnye ya nʼoke osimiri, ebe azụ buru ibu nọ loo ya. Mgbe Jona jikere ime ihe Chineke ziri ya, azụ ahụ gbọpụtara ya nʼelu ala. Emesịa Jona kwusaara ndị Ninive okwu Chineke, nke mere ka ha chegharịa. Ma nchegharị ndị Ninive chegharịrị wutere Jona, nʼihi na ọ bụrịị ọchịchọ obi ya ka Chineke laa ha nʼiyi. Ma akwụkwọ a na-egosi anyị na ọ bụghị ọchịchọ Chineke ka ndị mmadụ laa nʼiyi. E jikwa ọnụnọ Jona nọrọ nʼafọ azụ maa atụ ọnụnọ nke Kraịst nọrọ nʼili. (Lee Matiu 12:38-41).
Usoro e si dee ya:
Nnupu isi Jona 1
Ekpere Jona nʼafọ azụ 2
Nrube isi Jona 3
Obi ọjọọ Jona na obiọma Chineke 4
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Jona Ihe dị nʼime ya: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.