Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nehemaya 1

1
Ekpere Nehemaya
1Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya:
Nʼọnwa Kislev,#1:1 Nke a bụ ọnwa itoolu nʼafọ. Zek 7:1 nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses#1:1 Nke bụ mgbe narị afọ itoolu nʼotu gasịrị site na mgbe ndị mbụ si Babilọn lọghachitara. Ọ bụ na Senchuri nke anọ tupu a mụọ Kraịst. Neh 2:1 mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,#1:1 Ọ bụ ụlọeze dị na ndagwurugwu mmiri Taịgris, ebe ndị eze atọ chịrị obodo Peshịa na-ebi nʼoge oke oyi. Est 1:2; Dan 8:2 2otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani,#1:2 Ọ ga-abụ onye nne ji ya na Nehemaya, onye bịara zie ya ozi banyere ọnọdụ Jerusalem. Neh 7:2 na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.
3Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara#1:3 E kewara alaeze Peshịa mpaghara atọ. Nʼobodo Sameria ka ndị na-achị mpaghara Juda nọ. nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
4Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ, 5si ya:
“Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m. 6Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị. 7Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.
8“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. 9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’
10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta. 11Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.#1:11 Eze a na-ekwu maka ya nʼebe bụ Ataksekses, Ezr 4:21
Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Nehemaya 1: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye