Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 14

14
1Abaija we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya: ala di jū n'ubọchi-ya arọ iri. 2Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya: 3o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim; 4ọ si Juda ka ha chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, na ime iwu na ihe enyere n'iwu. 5O si-kwa-ra n'obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n'iru ya. 6O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n'ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n'arọ ndia; n'ihi na Jehova mere ka o zuru ike. 7O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n'iru ayi rue ub͕u a, n'ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma. 8Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà. 9Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha. 10Esa we pua izute ya, ha we do agha n'usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha. 11Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi. 12Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga. 13Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n'ihi na etipiara ha n'iru Jehova na n'iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku. 14Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n'ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n'agha; n'ihi na ọtutu ihe-nluta-n'agha di nime ha. 15Ọzọ kwa, ha tib͕uru ndi ulo-ikwū nke anu-ulo, we chiri n'agha ìgwè ewu na aturu n'uba na camel, lata na Jerusalem.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 14: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye