DANIEL 5:25-28
DANIEL 5:25-28 IGBOB
Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN. Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue. TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi. PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.

