Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 25

25
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim. 3Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla; 4na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu; 5na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia; 6na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me; 7na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi. 8Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha. 9Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.
10Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi. 11I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n'elu-ya buruburu. 12I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ. 13I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo. 14I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu. 15Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya. 16I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi. 17I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi. 18I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie. 19Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua. 20Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi. 21I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi. 22M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.
23I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi. 24I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 25I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu. 26I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n'ukwu anọ ya. 27Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu. 28I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table. 29I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha. 30I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.
31I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya: 32alaka isi ganēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ: 33iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ gādiri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa: 34iko anọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha: 35otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna waputa. 36Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu. 37I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya. 38Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa. 39Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka agēji ma ya, ya na ihe ndia nile. 40Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n'ugwu a.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 25: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye