Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 30

30
1I gēme kwa ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ: osisi acacia ka i gēji me ya. 2Otù cubit ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi kwa; ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu: cubit abua ka idi-elu-ya gādi kwa: mpì-ya nile gēsite na ya. 3I gāmachita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpì-ya nile; i gēme-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 4Nb͕a-aka ọla-edo abua ka i gēme-kwa-ra ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, i gēme ha n'elu akuku-ya abua; ha gābu kwa ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya. 5I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo. 6I gētiye ya n'iru ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ib͕e ihe-àmà, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ebe M'gēzute gi. 7Eron gēsure kwa n'elu ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me: kwa-ututu, mb͕e ọ nēdozi oriọna, ka ọ gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 8Mb͕e Eron nēweli oriọna n'etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n'iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile. 9Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n'elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya. 10Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.
11Jehova we gwa Moses okwu, si, 12Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n'etiti ha si di, ha nile n'otù n'otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti ha mb͕e i nāgukọta ha. 13Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova. 14Onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova. 15Ọgaranya agaghi-enye kari, ma ob͕eye agaghi-enyebì kari, nkera shekel ahu, mb͕e ha nēnye àjà-nbuli nke Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie. 16I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
17Jehova we gwa Moses okwu, si, 18I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu. 19Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya: 20mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: 21ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.
22Jehova we gwa Moses okwu, si, 23Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, 24na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin: 25i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu. 26I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu, 27na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, 28na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya. 29I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ. 30Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà. 31I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile. 32Ọ bughi n'anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu. 33Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.
34Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù; 35i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ: 36i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n'iru ihe-àmà ahu n'ulo-ikwū nzute, ebe M'gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu. 37Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n'ebe Jehova nọ. 38Onye ọ bula nke gēme nke di ka ya, inu ísì-ya, agēbipu kwa ya n'etiti umu-nna-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 30: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye