Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 22

22
1Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù.
Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra? 2Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha. 3Ndi-ọchi-agha-gi nile ab͕apuwo n'otù, ekere ha ab͕u n'enweghi uta: ndi-gi nile achọtaworo, ekere ha ab͕u n'otù, rue ebe di anya ka ha b͕alagara. 4N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim. 5N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu. 6Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta. 7O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama. 8O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n'ulo oké ọhia anya n'ubọchi ahu. 9Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru. 10Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike. 11Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya. 12Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu: 13ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu. 14Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.
15Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si, 16Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu! 17Le, Jehova gaje itudasi gi ike, gi nwoke; e, Ọ gaje ipiakọta gi apiakọta. 18Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi! 19M'gākwapu kwa gi n'ebe-nguzo-gi siri ike, o gēsi kwa n'ọnọdu-gi dọda gi. 20Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia: 21M'gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n'úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M'gēnye ya n'aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna. 22M'gātukwasi kwa nkpisi-ugodi ulo Devid n'ubu-ya; o we meghe, ọ dighi kwa onye nēmechi; o we mechie, ọ dighi kwa onye nēmeghe. 23M'gākpọgide kwa ya dika ǹtú n'ebe kwesiri ntukwasi-obi; ọ gāghọ-kwa-ra ulo nna-ya oche-eze nsọpuru. 24Ha gēkokwasi kwa ya nsọpuru nile nke ulo nna-ya, umu-ya na umu-nna-ya, ihe nile nke di ntà, site n'ihe nile bu ọkwa we rue ihe nile bu karama. 25N'ubọchi ahu (ọ bu ihe si n'ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta) ka ǹtú nke akpọgideworo n'ebe kwesiri ntukwasi-obi gāpu n'ọnọdu-ya; ewe b͕utue ya, o we da, ewe bipu ibu di n'elu ya; n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 22: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye