Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 24

24
1Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa. 2O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma. 3Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n'agha; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu a. 4Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa, ndi di elu nke ndi uwa atalatawo. 5Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 6N'ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n'ihi nka ka ndi bi n'uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu. 7Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n'obi ezewo ume. 8Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo. 9Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya gādi ndi nāṅu ya ilu. 10Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n'efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata. 11Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ. 12Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama. 13N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo. 14Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike. 15N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.
16Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u. 17Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa. 18Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu. 19Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya. 20Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.
21Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gēwere nmehie nke usu-ndi-agha nke ebe di elu leta ha n'ebe di elu, Ọ gēwere kwa nmehie nke ndi-eze nke uwa leta ha n'elu uwa. 22Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha. 23Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 24: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye