Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 20

20
1Zofa, bú onye Neama, we za, si,
2N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,
Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.
3Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere,
Mọ nke nghọtam nāzakwam.
4Ì mawo nka site na mb͕e ochie,
Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
5Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,
Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
6Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,
Isi-ya ewe metu igwe-oji;
7Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:
Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
8Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:
Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.
9Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;
Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
10Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,
Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.
11Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,
Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
12Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,
Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;
13Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,
Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;
14Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,
Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.
15O lodawo àkù, we b͕oputa ya:
Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.
16Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:
Ire agwọ gēb͕u ya.
17Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,
Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.
18Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;
Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.
19N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;
Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.
20N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,
Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.
21Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;
N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.
22N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:
Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.
23Ka o rue, n'iriju afọ-ya,
Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,
Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.
24Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,
Uta ọla gāb͕apue ya.
25Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta:
Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta;
Oké ujọ nile di n'aru ya.
26Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:
Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;
Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.
27Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,
Ala nēbili kwa imegide ya.
28Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ,
Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.
29Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke,
Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye