Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 24

24
1Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara. 2Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya. 3Ọ we tua ilu-ya, si,
Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,
Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
4Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,
Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,
Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
5Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!
Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!
6Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,
Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,
Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,
Dika osisi cedar n'akuku miri.
7Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa,
Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri,
Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,
Agēbuli kwa ala-eze-ya.
8Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta;
Ume dika ume atu ka ọ nwere:
O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,
Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,
Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.
9Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,
Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?
Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,
Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.
10Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia. 11Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru. 12Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si, 13Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu? 14Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia. 15Ọ we tua ilu-ya, si,
Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,
Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:
16Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,
Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu,
Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu,
Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:
17Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:
Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:
Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,
Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie,
We mapue akuku nile nke Moab,
Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,
18Edom gābu kwa ihe-nnweta,
Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;
Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.
19Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,
Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.
20Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,
Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;
Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.
21Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,
Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,
Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.
22Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,
Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.
23Ọ we tua ilu-ya, si,
Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?
24Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia,
Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala,
Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.
25Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 24: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye