ABÙ ỌMA 106
106
1Tonu Ja.
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova?
Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?
3Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu,
Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.
4Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam;
Were nzọputa-Gi letam:
5Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,
Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi,
Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,
Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt;
Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;
Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,
Ime ka amara idi-ike-Ya.
9O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:
O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì,
B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:
Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.
12Ha we kwere okwu-Ya nile;
Ha nābù abù otuto-Ya.
13Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;
Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara,
We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
15O we nye ha ihe ha riọrọ;
Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.
16Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,
Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17Ala nēmeghe, we loda Detan,
Kpuchi kwa nzukọ Abairam.
18Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha;
Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.
19Ha nēme nwa-ehi na Horeb,
We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.
20Ha we b͕anwe nsọpuru-ha
N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.
21Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha,
Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;
22Oké ọlu di iche iche n'ala Ham,
Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.
23O we si na O gēkpochapu ha,
Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya,
Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.
24Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike,
Ha ekweghi okwu-Ya;
25Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha,
Ha egeghi nti n'olu Jehova.
26O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ,
Ime ka ha da n'ọzara:
27Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile,
Na ichusa ha n'ala nile.
28Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa,
We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.
29Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe:
Ihe-otiti we dakwasi ha.
30Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe:
Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.
31Ewe guara ya nka n'ezi omume,
Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.
32Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba,
O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha:
33N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya,
O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu.
34Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu,
Dika Jehova siri ha;
35Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu,
We muta ọlu nile ha:
36Ha we fè arusi nile ha òfùfè;
Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:
37Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,
38We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,
Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà;
Ewe were ọbara merua ala ahu.
39Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú,
Ha we nākwa iko n'omume nile ha.
40Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya,
O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.
41O we nye ha n'aka mba di iche iche;
Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.
42Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha,
Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha.
43Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha;
Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha,
Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.
44O we lekwasi ahuhu diri ha anya,
Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:
45O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha,
We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.
46O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha
N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.
47Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi,
Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile
Ikele aha nsọ Gi,
Na inya isi n'otuto-Gi.
48Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,
Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.
Ka ndi Israel nile si kwa, Amen.
Tonu Ja.
AKWUKWỌ NKE-ISE
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ABÙ ỌMA 106: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.