Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

TAITỌS 1

1
1Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke, 2n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue; 3ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n'oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n'aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n'iwu si di; 4Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.
5N'ihi nka ka m'rapuru gi na Krit, ka i we dozie ihe fọduru, do kwa madu ndi-okenye n'obodo nile ọ bula, dika mu onwem nyere gi iwu; 6ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n'iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n'okpuru iwu. 7N'ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n'iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku; 8kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike; 9nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya.
10N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta, 11ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n'èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n'ihi urù nēweta ihere. 12Otù onye n'etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu. 13Àmà nka bu ezi-okwu. N'ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n'anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, 14ka ha ghara iṅa nti akukọ-irò ihe di iche nke ndi-Ju, na ihe di iche iche nke madu nyere n'iwu, bú ndi nēchighari rapu ezi-okwu ahu. 15Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha. 16Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

TAITỌS 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye