Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI KỌLỌSI 3:23-24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI KỌLỌSI 3:23-24 IGBOB (Bible Nso)

ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist.

NDI KỌLỌSI 3:23-24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.