NEHEMAIA 1:5-6
NEHEMAIA 1:5-6 Bible Nso (IGBOB)
si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere: biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.
NEHEMAIA 1:5-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
si ya: “Gị, ONYENWE ANYị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m. Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.