NEHEMAIA 1:7-9
NEHEMAIA 1:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu. Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile: ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.
NEHEMAIA 1:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis. “Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’