Ngosi ihe ndị achọpụta maka ihe
NDI EFESỌS 4:26 (IGBOB)
Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:
JEMES 1:19 (IGBOB)
Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:
JEMES 1:20 (IGBOB)
n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.
NDI EFESỌS 4:31 (IGBOB)
Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:
ILU 19:11 (IGBOB)
Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.
MATIU 5:22 (IGBOB)
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.
ABÙ ỌMA 37:8 (IGBOB)
Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.
ILU 14:29 (IGBOB)
Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.
ILU 15:1 (IGBOB)
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.
EKLISIASTIS 7:9 (IGBOB)
Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.
ILU 29:11 (IGBOB)
Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.
ILU 16:32 (IGBOB)
Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.
ILU 15:18 (IGBOB)
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.
NDI ROM 12:19 (IGBOB)
Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.
NDI KỌLỌSI 3:8 (IGBOB)
Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta
ỌNU-ỌGUGU 23:8 (IGBOB)
Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi. Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.
ABÙ ỌMA 78:49 (IGBOB)
Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha, Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u, Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.
ABÙ ỌMA 69:24 (IGBOB)
Wukwasi ha iwe-Gi, Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.
II. NDI-EZE 23:26 (IGBOB)
Otú ọ di, Jehova esighi n'idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n'ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.
DEUTERONOMI 9:8 (IGBOB)
Na Horeb ka unu kpasu-kwa-ra Jehova iwe, Jehova we wesa unu iwe ikpochapu unu.
ABÙ ỌMA 85:3 (IGBOB)
I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi: I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.
MAK 10:41 (IGBOB)
Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn.
ABÙ ỌMA 90:11 (IGBOB)
Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?
ABÙ ỌMA 85:5 (IGBOB)
Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?
ABÙ ỌMA 2:12 (IGBOB)
Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.