“Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m.
Aga m echebe gị, gbaa gị ume,
nʼihi na eweere m gị nye ndị m
ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike.
Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.