Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru,
bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri,
nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.
Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ,
mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ,
dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.