Ọ dị ụzọ ihe isii ONYENWE ANYị kpọrọ asị,
e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
Anya dị nganga,
ire na-ekwu okwu ụgha,
aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
Obi na-echepụta nzube ọjọọ;
ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri
na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.