1
EKLISIASTIS 4:9-10
Bible Nso
Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu. N'ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa EKLISIASTIS 4:9-10
2
EKLISIASTIS 4:12
Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.
Nyochaa EKLISIASTIS 4:12
3
EKLISIASTIS 4:11
Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku?
Nyochaa EKLISIASTIS 4:11
4
EKLISIASTIS 4:6
Ọ di nma, bú otù nju-aka n'izu-ike, kari nju-aka abua n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu na ichọ ijide ifufe.
Nyochaa EKLISIASTIS 4:6
5
EKLISIASTIS 4:4
Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
Nyochaa EKLISIASTIS 4:4
6
EKLISIASTIS 4:13
Ọ di nma, bú nwata nke bu ob͕eye ma ọ mara ihe, kari eze nke bu okenye ma ọ bu onye-nzuzu, onye nāmaghi inara nmata-ihe ọzọ.
Nyochaa EKLISIASTIS 4:13
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị