Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 46

46
Abụ Ọma 46
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ.
Chineke bụ ebe mgbaba anyị
1Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
3Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
6Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
9Ọ na-eme ka agha kwụsị
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,
ma na-esu ọta#46:9 Maọbụ, ụgbọ agha agha niile ọkụ.
10Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 46: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye