Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 47

47
Abụ Ọma 47
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Chineke bụ eze nke ụwa
1Kụọnụ aka unu, unu mba niile;
jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.
Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;
ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,
ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela
5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.
Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;
bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.#47:6 Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.
Jirinụ abụ too ya.
8Chineke bụ eze mba niile;
ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,
dịka ndị Chineke nke Ebraham,
nʼihi na ndị eze#47:9 Maọbụ, ọta niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;
ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 47: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye