Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 1

1
1Pọl, onye akpọrọ ibu onye-ozi nke Jisus Kraist site n'ọchichọ nke Chineke, na Sostenis nwa-nna-ayi, 2nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha: 3Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
4Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus; 5na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile; 6dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu: 7nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; 8Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 9Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.
10Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. 11N'ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n'etiti unu. 12Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist. 13Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl? 14Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs; 15ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem. 16Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism. 17N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.
18N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke. 19N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,
M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì,
M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta.
20Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu? 21N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere. 22Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe: 23ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu; 24ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke. 25N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike.
26N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ: 27Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike; 28ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè: 29ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke. 30Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa: 31ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI KỌRINT 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye