Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 19

19
1Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala, 2si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali. 3O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie. 4Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n'akuku ọ bula; 5ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n'abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha. 6Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n'azu ya. 7Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ. 8Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m'kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n'anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka ha biara n'okpuru ndò nke ulom. 9Ha si, Pua n'uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ. 10Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n'ulo, ha we mechie uzọ. 11Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n'ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu. 12Ndikom ahu we si Lot, Ọ̀ di onye i nwere n'ebe a ọzọ? di nwa-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom, na onye ọ bula i nwere n'obodo a; me ka ha si n'ebe a pua: 13n'ihi na ndi nēbibi ebe a ka ayi bu, n'ihi na iti-nkpu-ha aghọwo ihe uku n'iru Jehova; Jehova ezitewo kwa ayi ibibi ya. 14Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya. 15Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n'ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n'ahuhu ajọ omume obodo a. 16Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n'ihi na Jehova nwere ọmiko n'aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n'azu obodo. 17O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi. 18Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem: 19biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua: 20biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu. 21Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya. 22Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa. 23Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa. 24Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ; 25O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala. 26Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú. 27Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova: 28ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.
29O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.
30Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua. 31Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di: 32bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 33Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 34O rue n'echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n'abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n'abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 35Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 36Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n'aka nna-ha. 37Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta. 38Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 19: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye