Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 20

20
1Abraham we si n'ebe ahu bulie ije n'uzọ ala Negeb, biri n'etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera. 2Abraham we kwue okwu bayere Sera, bú nwunye-ya, si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: Abimelek, bú eze Gera, we zìe ozi, kuru Sera. 3Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru. 4Ma Abimelek akābiaghi nso ya: ọ we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu kwa mba nke nēme ezi omume ka I gēb͕u? 5Ọ̀ bughi nwoke ahu sirim, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? nwayi ahu kwa, ọbuná ya onwe-ya siri, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu: n'izu-okè nke obim na n'emeghi-ihe-ọjọ nke ọbu-akam abua ka m'meworo nka. 6Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka. 7Ma ub͕u a me ka nwunye nwoke ahu laghachi; n'ihi na onye-amuma ka ọ bu, ọ gēkpe kwa ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghi ka ọ laghachi, gi mata na i ghaghi inwu anwu, gi onwe gi, n'ihe nile inwere. 8Abimelek we bilie n'isi-ututu, kpọ ndi-orù-ya nile, kwue okwu ndia nile na nti-ha: ndikom ahu we tua egwu nke-uku. 9Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m'mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m. 10Abimelek si kwa Abraham, Gini ka i huru, na i mewo ihe a? 11Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem. 12Ọzọ kwa, ọ bu nwa-nnem nwayi n'ezie, nwa-nwayi nnam ka ọ bu, ọ bu nání na ọ bughi nwa-nwayi nnem; ọ we ghọrọm nwunye: 13o rue, mb͕e Chineke merem ka m'si n'ulo nnam waghari, na asirim ya, Nka bu ebere-gi nke i gēmerem; n'ebe nile ọ bula nke ayi gābiaru ebe ahu, gi kwue okwu bayerem, si, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu. 14Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, nye Abraham, me kwa ka Sera nwunye-ya laghachikute ya. 15Abimelek we si, Le, alam di n'iru gi: biri n'ebe di nma n'anya-gi. 16Ọ si Sera, Le, enyewom nwa-nne-gi nnù nkpuru-ego ọla-ọcha abua na ọgu iri: le, nke ahu buru gi ihe-nkpuchi anya n'ebe ndi nile nọ, bú ndi gi na ha nọ; ọ bu kwa n'iru madu nile ka emeziworo gi. 17Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya na orù-ya ndinyom nma; ha we mua umu. 18N'ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n'ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye