Ibi ndụ n'okwukweIhe Atụ
Ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi
Akwụkwọ Nsọ kọwara nkeọma ụbọchị ikpeazụ ( oge dị nke nke maka ọbịbịa nke Kraịst) dịka ụbọchị oké egwu. Ogo nke ihe ọjọọ na ụrụ dị iche iche ga-abawanye. Ụbọchị nke oké egwu a bụ ụbọchị dị ike nke nwere ike ị napụ ndị kwere ekwe okwukwe ha ma mee kwa ka ha bie ndụ mebiri okwukwe ha. Ọrụ anyị n'ebe Chineke nọ bụ ka anyị leghara ụfọdụ nke ụwa a anya nke ga-eme ka ihe anyị na eme tọọ Chineke ụtọ.
E nweghị obi ụtọ, ntụkwasị obi ụfọdụ na-amazi jijiji ma ụfọdụ adapụwo n'okwukwe. Chineke ji okwu ya agba anyị ume n'akwụkwọ Hibru 19:35. Ya mere unu atụfula okwukwe unu, bụ ihe nke nwere oké nyeghachi nke ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ bụ ihe ana enye nde mmadụ maka ntụkwasị obi na nyefe n'aka maka ezigbo nchekwa. Onye ọbụla nke nyefere onwe ya n'aka Jizọs ma nọgide ruo n'ọgwụgwụ, ọ kwere onye ahụ nkwa inye ya ndụ ebighị ebi.
A na-enweta nzọpụta nke ebighi ebi site n'okwukwe nke na-o nweghị oji ọrụ anyị eme. Ihe ụgwọ ọrụ Chineke ga-enye anyị mgbe anyị fechaara ya bụ ụgwọ ọrụ ebighi ebi. Ụgwọ ọrụ a nke a ga-enye anyị bụ n'obibịa nke Chineke, ọga abụkwa dịka ọrụ anyị siri dị. Matiu 16:27 kwụrụ sị: N'ihi na nwa nke mmadụ ga-abịa n'ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enye ghaghị onye ọbụla dịka omume ya si dị.
Anyị nwa ịnata ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi a, nke dị oké ọnụ, anyị ga-ọgba mbọ ghara ịtufu atụghi ụjọ, agbamume nke okwukwe n'ime Chineke na nkwa ya niile. Anyị ga-agba mbọ na-eso ụkpụrụ maọbụ ụdịdị ndụ nke Jizọs Kraịst. Onye nke biara ịgbapụta mmadụ n'ụwa ma bụrụkwa onye wetara ụgwọ ọrụ nke ebube n'eluigwe. E bulielarị aha ya kachasị aha niile elu ma n'eluigwe ma n'ụwa.
Akwụkwọ Nsọ kwụru sị ọ diri ọnwụ nke obe n'agbanyeghị ihe ihere, ma e mechara nọrọ n'aka nri nke Nna ya n'oche eze. E nwere ọtụtụ ihe ndị na-eto anyị akpịrị na ọtụtụ ihe ndị na-emegharị anyị anya n'ụwa taa. Anyị ga-agba mbọ legide Jizọs anya. Jizọs ga-abụrịrị ụkpụrụ ị na-eso n'ibi ndụ gị maka na, ọ bụ ya bụ onye nwe anyị na isi iyi nke okwukwe anyị. Dịka anyị na-elekwasị ya dị isi mmalite nke okwukwe, Ọ na-abanye ma na-etinye okwukwe n'ime anyị nke ga-eme ka anyị gbaa ọsọ ka ụmụ Chineke nke ọma ma gbaruo ya n'isi. N'agbanyeghị ihe ọbụla dị njọ ị na-ahụ gburugburu gị jidesie okwu Chineke ike. Ọ dị mkpa mmadụ ịkụ mkpụrụ nke ndịdị, "n'ihe ma onye ọbụla chọrọ ndịdị nke ga-abụ mgbe ị mechara uche Chineke onye ahụ a ata nkwa nke Chineke. Inweta ihe ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi gbadoro ụkwụ n'okwukwe anyị ya na ime uche nke Chineke.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Galetia 2:20, Mkpughe 22:12, 2 Timoti 4:7-8, Hibru 12:1-2.
Ekpere: Nna nye m amara ka m ruo n'isi nke ga-eme ka m keta ụgwọ ọrụ nke m n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Atụmatụ e wepụtara gbadoro ụkwụ na mkpughe nke ihe niile maka onye kwere ekwe na njem ezi ọnọdụ nwa oge n'elu ụwa. Ibi ndụ n'okwukwe, bụ arịlịka nke mmadụ nke a kpọọ nwa nwere okwukwe, mgbe Nna ya ukwu ga-abiaghachite.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg