Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Enwere M Ike Ịmeri Mmehie na Ọnwụnwa N'Ezie?Ihe Atụ

Can I Really Overcome Sin and Temptation?

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Enwere M Ike Ịmeri Mmehie na Ọnwụnwa N'Ezie?

Na 1 Samuel 13:14, Samuel onye amụma gwara Sọl, bụ́ eze Izrel, na a na-anọchi anya ya n’ihi na “Onye-nwe-anyi achọtawo mmadụ dị ka obi Ya si dị, Onye-nwe-anyị enyewokwa ya iwu ịbụ onyeisi nke ndị Ya.”

Otú ọ dị, ọtụtụ iri afọ ka e mesịrị, "nwoke ahụ dị ka obi Ya si dị" nwere mmekọahụ ya na nwanyị lụrụ di, nke mere ka nwanyị ahu dị ime, makwa nwoke ahụ kpara nkata gara nke ọma igbu di nwanyị ahụ ọ tuwara ime ka ọ wee were nwanyị ahụ dika nwunye ya.

N'otu ihe omume a, Eze Devid mebiri itoolu n'ime Iwu Iri ahụ:

10: Ọ nwere akpiri n'ebe nwunye onye agbata obi ya nọ.

9: Ọ ghaara ụgha banyere mmehie ya.

8: Ọ zuuru ya maka onwe ya.

7: Ọ kwara iko.

6: Ọ gburu di nwaanyi ahu.

5: Ọ wedara nne na nna ya ala.

2: Ọ mere ka Bat-sheba buru arusi.

Nke mbu na nke ato: Ọ menyere Chineke na aha Ya ihere.

Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ Devid emebighị iwu nke Ụbọchị Izu Ike—dị nnọọ ka anyị maara.

Gịnị mere mmadụ di ka obi Chineke siri di jiri mee ihe a?

Gịnị mere anyị ji eme mmehie? Olee otú anyị ga-esi merie ọnwụnwa? Kedu ihe anyị ga-eme mgbe anyị na-emerighi ọnwụnwa?

Nke a bụ ihe anyị ga-atụle n’ime ụbọchị anọ na-abịa.

Na-Atụ Anya na A Ga-Anwa Gị

Mgbe Jizọs meriri mwakpo Ekwensu, onye iro “hapụrụ Ya ruo mgbe oge ozo ga-adikwa” (Luk 4:13). Ọ bụrụ na a nwara Onye-nwe-anyị ọnwụnwa, otu ahụ ka anyị ga-enwekwa.

Ekwensu dị adị n’ezie, ọ kpọkwara gị asị. Ị bụ onye iro ya. Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị na ekwensu bụ “onye ogbu mmadụ site ná mmalite,” na “onye ụgha na nna ụgha” (Jọn 8:44). Ọ bụ “ọdụm na-eme mkpotu na-achọ onye ọ ga-eripịa” (1 Pita 5:8). Ọ na-anwa ma na-eduhie onye ọ bụla n’ime anyị.

Nke a bụ ihe kpatara ya: “Mgbe agụụ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụ mmehie; ma mmehie, mgbe ọ tolitere, na-amụpụta ọnwụ” (Jemes 1:15).

Tinye ya akara ncheta: mmehie na-ebugariri gị karịa ka ị chọrọ ịga, na-edobe gị ogologo oge karịa ka ịchọrọ ịnọ, makwa na-efu gị karịa ka ịchọrọ ịkwụ.

Mgbe niile.

Naanị jụọ Eze Devid. Gụọ 2 Samuel 12 maka ihe ndị mputa na-emebi emebi sitere n'omume ojoo ya.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Can I Really Overcome Sin and Temptation?

Ị jụtụla onwe gị sị, “Gịnị mere m ka ji na-agba mgba megide mmehie ahụ?” Ọbụna Pọl onyeozi kwuru nnọọ ná Ndị Rom 7:15, sị: “Anaghị m eme ihe m chọrọ, kama ana m eme kpọmkwem ihe m kpọrọ asị.” Olee otú anyị ga-esi kwụsị mmehie ka ọ hara ịkwụsị ndụ ime mmụọ anyị? Ọ ga-ekwekwadi omume? Ka anyị tụlee mmehie, ọnwụnwa, Ekwensu, na n'ime obi ekele, ịhụnanya Chineke.

More

Anyị chọrọ ikele Denison Forum maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: http://www.denisonforum.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara