Enwere M Ike Ịmeri Mmehie na Ọnwụnwa N'Ezie?Ihe Atụ
Gịnị Ka Ọ Ga-Apụta Ma Ọ Bụrụ Na Adabawọ M N'Ọnwụnwa?
Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na ọ nweghịzi ihe a ga-eme maka ya?
Ị lụsoro ọnwụnwa ọgụ n'ike nke gị—wee daa mba.
Ugbu a ị gụzo di ka onye ikpe mara n’ihu Onye-nwe-anyị dị nsọ nke nwe eluigwe na ala.
Anyị niile anọwo ebe ahụ: “Ọ bụrụ na anyị asị na anyị enweghị mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị ma eziokwu adịghịkwa n’ime anyị” (1 Jọn 1:8).
Nke a bụ ihe anyị ga-eme: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi na onye ezi omume, Ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị ma sachapụ anyị ajọ omume niile” (amaokwu 9).
Wegaara Nna gị mmehie gị—ugbu a.
Nabata ihe ọjọọ ịmere, chegharịa maka ọdịda gị, ma rịọ Ya maka mgbaghara Ya.
Jigidesie ike nkwa Ya maka ịgbaghara mmejọ na mmehie gị, ihichapụ ihe ọjọọ niile ịmere ka ọ dị ọcha ma ghara icheta ọdịda gị ọzọ.
Mgbaghara Chineke ọ̀ pụtara na anyị pụrụ idi na-emehie na ekwupụta otu ọ siri masi anyi, na emehie ma na-ekwupụtakwu di ka ọ siri masi anyi?
A gaghi eme nke a ma ọ dighi ihe ga-esi na ya pụta.
Enwere m ike igbanye ntu n'ime osisi, ị nwekwara ike ịdọpụta ya—mana oghere ahụ ga-adikwa. Enweghị ike ị nwetaghachi nrubeisi ajụrụ ajụ. Ụgwọ ọrụ maka nrubeisi bụ ihe funarịrị efunarị ruo mgbe ebighị ebi.
Chineke na-agbaghara, mana ihe mgbu nke mmehie anyị ka na-ewute—anyị onwe anyị nakwa ndị ọzọ.
Otú ọ sina dị, Onye ahụ Ọkpara Ya nwụrụ n’ọnọdụ anyị iji wee kwuo ugwo anyi ji pụrụ ịgbaghara anyị: “Chineke na-egosipụta ịhụnanya nke Ya n’ebe anyị nọ n’ime nke a: Mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8).
Ikpe ọmụma abụghị ihe sitere na Chineke.
Nna anyị hụrụ onye ọ bụla n’ime ezinụlọ Ya n’anya. Ma anyị ka bụ ụmụ Ya, ọ bụnadi mgbe anyị na-adịghị eme otú ahụ.
Amara bụ inweta ihe oma anyị na-ekwesịghị inweta; ebere bụ enwetaghị ihe ọjọọ kwesiiri anyi.
Nna anyị nke bi n’eluigwe na-enye ha abụọ.
Ọ di gi mkpa imeghe onyinye nke mgbaghara Ya taa?
Ọ bụrụ otu ahụ, echela. Gwa Nna gị nke bi n'elu-igwe okwu. Ọ na-agụsi Ya agụụ ike ịnụ ọlụ gị, nwa Ya nke Ọ hụrụ n'anya.
---
Ịgụkwu gbasara imeri mmehie na ọnwụnwa, budata isiakwụkwọ nke mbụ nke Akwụkwọ Dr. Denison, Mmeghie Asaa N'Egbu Egbu, n'akwughị ugwo ọbụla.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ị jụtụla onwe gị sị, “Gịnị mere m ka ji na-agba mgba megide mmehie ahụ?” Ọbụna Pọl onyeozi kwuru nnọọ ná Ndị Rom 7:15, sị: “Anaghị m eme ihe m chọrọ, kama ana m eme kpọmkwem ihe m kpọrọ asị.” Olee otú anyị ga-esi kwụsị mmehie ka ọ hara ịkwụsị ndụ ime mmụọ anyị? Ọ ga-ekwekwadi omume? Ka anyị tụlee mmehie, ọnwụnwa, Ekwensu, na n'ime obi ekele, ịhụnanya Chineke.
More