Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 8 NKE 12

Igụzọgide Ịhụnanya

Ọ bụrụ na Kraịst bụ ịhụnanya na ịhụ n'anya dị ka Kraịst bụ ihe mgbaru ọsọ, mgbe ahụ a ga-enwe mmegide megide nchụso a. Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya, mgbe ahụ Ekwensu bụ́ onye iro anyị na-emegide nnọọ nke a. Ndụ abụghị naanị ihe siri ike, ọ bụ agha. Dị nnọọ ka ọ dị mkpa ka atụrụ nwe onye ọzụzụ atụrụ ga-eme ka ọ nọgide n’ụzọ ziri ezi na ka ọ nọrọ ná nchebe, anyị kwesịrị ịsogide Onye-nwe-anyị ka anyị ghara ịkpagharị, idi nduhie site n'ihe ndị n'akpafu uche dị n’ime ụwa, ifu efu n’ime onwe anyị, ma ọ bụ ndị iro ighọgbu anyị.

Anyị nwere ike ịhụ adịghị ike nke onwe anyị ma soro onye Puritan ahu tie mkpu si, “Onye-nwe-anyi, abụ m mkpomkpo jụpụtara n'ntụ . . . Abụghị m ihe juru anya dị oke ọnụ ahịa, a bụ m nke na-enweghị ihe ọ bụla na nke n'adịghị ihe ọ bụla bara uru ọ pụtara . . . Ekwenyesiri m ike nke ukwuu maka ihe ọjọọ na nhụsianya nke ọnọdụ mmehie, na ihe efu nke ihe e kere eke" (nke sitere na "Mmadu N'Abụghi Ihe Ọbụla," n'ime Ndagwurugwu Ohuu).

Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya na anyị atụkwasiwọ obi na Kraịst dịka Onye-nwe-anyị na Onye Nzọpụta anyị, anyị ma na a hụrụ anyị n’anya. Anyị makwaara na a napụtawo anyị n'alaeze nke ọchịchịrị nke na-emegide ịhụnanya ma banye n'alaeze nke ezi ịhụnanya a. Ugbu a, anyị chọrọ ịma ka esi aga ije na ya. Olee otú anyị ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ilekwasị anya n’ozi ọma na ịbụ ndị ozi-ọma na-enye ume:

-ozi ọma bụ ntọala nke ezi ịhụnanya
-ozi ọma na-egosipụta ịhụnanya
-ozi ọma na-akọwa ịhụnanya
-ozi ọma na-enyere anyị aka ịzaghachi n'ịhụnanya

Kwa ụbọchị anyị ga-arịọ Onye-nwe-anyị ka Ọ nyere anyị aka iso Ya, ije ije n'ịhụnanya Ya, hụ Ya n'anya, na gbatịa ịhụnanya Ya.

Itinye Eziokwu N'Obi: Họrọ otu ebe n'Akwụkwọ Nsọ ị ga-etinye n'obi iji mee ka uche gị dị ọhụrụ ma gbanwee obi gị.

Ime Ka Ọchichọ Odinma Onwe Onye Nwụọ: Olee mmeghie a na-ekwu maka ya kpomkwem n'ndụ gi site n'otu ebe Akwụkwọ Nsọ ahu ị detụrụ? Pọl na-agwa anyị kpọmkwem ka anyị yipụ onwe anyị ahụ dị ochie.

Iweta Eziokwu Ka Ọ Di Ìhè Na Ndụ: Yikwasị onwe gị onwe ohụru--Kraịst. Olee mgbanwe kpọmkwem dị mkpa ka ị mee n'echiche gị ma ọ bụ n'àgwà gị ma ọ bụ n'omume gị iji na-edo onwe gị n'okpuru Ya ma tinye eziokwu Ya n'uche na n'obi gị?

Igodo: ubọchị_asatọ ubọchị_asatọ
Ụbọchị 7Ụbọchị 9

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

More

Anyị ga-achọ ikele Thistlebend maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org Igodo: ikike banyere atụmatụ a ikike banyere atụmatụ a