Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 1 NKE 12

Ịnwe Agụu Maka Ịhụnanya

Obi anyị niile na-enwe agụu siri ike maka ihụnanya ma anyị ma nke a ma ọ bụ na anyị amaghị. E mere anyị n'ezie ka anyị hụ n'anya. Chineke bụ ịhụnanya. Ọ na-agụsi gị agụụ ike ịmata ezi ịhụnanya nke Chineke? Iji nweta nke a, ọ na-agụsi gị agụụ ike iji obi gị niile, mkpụrụ obi gị niile, uche gị na ike gị niile hụ Ya n'anya ka Ọ si hụ gi n'anya?

Ma gịnị bụ ezi ịhụnanya? Okwu ahụ bụ ịhụnanya nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara. Anyị nwere ike ịkwu n'otu ume, "A hụrụ m kọfị n'anya. A hụrụ m nwunye m n'anya. A hụrụ m Jizọs n'anya." Olee otú anyị ga-esi mara ihe ezi ịhụnanya bụ n’ezie? Kedu ihe ọ yiri? Kedu udi mmetụta ọ na-enye? Ọ badiri uru?

Ezi ịhụnanya karịrị ihe na-ewụ ewụ, mmetụta, ozi, ma ọ bụ ụzọ nkuzi ewepụtara maka ozuzu ndi Kraist. Ezi ịhụnanya bụ ezi ọchịchọ maka ọdịmma nke onye ọzọ. Ezi ịhụnanya nke na-ewetara Chineke otuto bụ nzube nke ndụ na ịdị adị nke ụka.

Ụfọdụ na-ekwu na ozi bụ ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke ụka: "Ọrụ kasị elu nke Ụka bụ izisa ozi ọma ruo ụwa niile. Ozi nke ụka bụ izisa ozi ọma” (Oswald J. Smith).

Ndị ọzọ ga-asị na ọ bụ ofufe: “Ozi abụghị ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke ụka. Ọ bụ Ofufe. Ozi dị n'ihi na ofufe adịghị. Ofufe bụ nke kacha, ọ bụghị ozi, n'ihi na Chineke kasị elu, ọ bụghị mmadụ. Mgbe oge nke a gafeworo, ma ọtụtụ nde ndị a gbapụtara a na-eti ihu ha n"ala n'ihu ocheeze nke Chineke, ozi agaghị adị ọzọ. Ọ bụ mkpa nwa oge. Ma ofufe na-adị ruo mgbe ebighị ebi.” (John Piper).

Chineke nyere ndị Ya iwu ka ha jiri obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, na ike ha dum hụ Ya n'anya. Jizọs kwụkwara nke a ọzọ, na-agwa anyị na iwu bụ nke mbụ na iwu kachasị ukwuu bụ na anyị kwesịrị iji obi anyị dum, na mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum na ike anyị dum hụ Onye-nwe-anyị bụ́ Chineke anyị n'anya. Ọ na-agwa anyị na mmadụ niile ga-amata na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Ya site n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ. Ya mere Pọl jiri kọwaa n’akwụkwọ ozi ọ degaara ndị Kọrint na okwukwe, olileanya, na ịhụnanya bụ àgwà ọma na-adịgịde ruo mgbe ebighị ebi, ma nke kasị ukwuu n’ime atọ ndị a bụ ịhụnanya.

Ije-ozị na ofufe bụ ntowapụta nke ezi ịhụnanya.

Igodo: ụbọchị_otu ụbọchị_otu
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

More

Anyị ga-achọ ikele Thistlebend maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org Igodo: ikike banyere atụmatụ a ikike banyere atụmatụ a