Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 3 NKE 12

Enweghị Ike Ighọ Aghụghọ Ma Abia N'Ezi Ịhụnanya

Ezi ịhụnanya dị n’ime obi obi nke ozi ọma ma ozi ọma bụ ngosipụta nke ịhụnanya Chineke. Ozi ọma bụ omume ịhụnanya kasịnu. Ọ bụ nanị site n’ozi ọma ka anyị na-abịa anata ezi ịhụnanya a. Enyewọ anyi ikike imata ezi ihunanya, inụ ụtọ ezi ihunanya, ibi n'ezi ihunanya, na inye ezi ihunanya n'ime Kraist.

Kedu ihe bụ ozioma?

Ozioma bụ ozi ọma ahụ na mmadụ ewerewo ụta na ntaramahụhụ n’ihi anyị maka mmejọ anyị nile megide Chineke. Gịnị bụ ntaramahụhụ maka mmehie? Ọnwụ, ọnụma nke Chineke, ahụhụ ebighị ebi na nkewapụ n’ebe Chineke nọ n’ime ala mmụọ. Jizọs, naanị onye nwere ike ịkwụ ụgwọ maka mmehie anyị, bilitere, guzoro n'ọnọdụ anyị ma nara ntaramahụhụ NIILE kwesịirị anyị. Jizọs, zuru oke, enweghị mmehie ọ bụla, zuru oke na ị bụ Chineke na ị bụ mmadụ, tọgbọọrọ ndụ Ya maka anyị. Ya bụ Onye na-adighi nmehie naara nmehie anyi NIILE, ihe ọjọọ anyi NIILE, na ADỊGHỊ NMA anyị NIILE n'isi Ya, ma na-ngbanwe nye anyi idi nso Ya, agwa Ya, na EZI OMUME Ya.

Onye ahu tọgbọọrọ ndụ Ya n'ala chọrọ ka ị mata ụdị ịhụnanya a, nata ya, nweta ahụmahụ ya, bie ndụ na ya, ma nye ya ndị ọzọ.

Ị natawo ịhụnanya a? Ọ bụrụ na ị maara na ị nwetala mgbaghara nke Chineke na ị tụkwasịwo obi na Kraịst na ịhụnanya Ya, ihe ọzọ anyị chọrọ ịrịọ gị ka ị mee ugbu a bụ ikpe ekpere a dị mkpirimkpi tupu ị gawa n'ihu: "Onye-nwe-anyị, a na m arịọ Gị ka Ị meghee ntị m inu Okwu Gi, meghee anya m ihu Gi na ezi-okwu Gị, na meghe obi m ime otu Ị si chọọ n'ihe niile Ị na-egosi m. Nyere m aka ịghọta na i nweta ezi ịhụnanya Gị na i ghọtakwu ọtụtụ ihe Ị mewooro m na i nwe ike ibi ndụ n'ezi ịhụnanya Gị. Amen.”

Ịhụnanya Chineke n’ebe i nọ bụ ịhụnanya kachasị. Ịghọta na ịnata na ikwere ezi ịhụnanya Ya dị mkpa dị ntọala maka ndị anyị bụ, mmekọrịta anyị na Kraịst, na ihe niile anyị na-eme n'akụkụ ọ bụla nke ndụ anyị. Ma anyị ga na-eje ije n’ịhụnanya Ya maka anyị nwa oge n’otu oge.

Igodo: ubọchị_ato ubọchị_ato
Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

More

Anyị ga-achọ ikele Thistlebend maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org Igodo: ikike banyere atụmatụ a ikike banyere atụmatụ a