Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ
![What Is True Love?](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapistaging.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans-staging%2F31668%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Otú Anyị Si ECHE Adighị Abụkari EZIOKWU
Tụlee nke a: Otú anyị si ECHE Adighị abụkari EZIOKWU. Ọ na-adị mfe mmetụta uche anyị ighọgbu anyị. Omume anyị na àgwà anyị na-agwa anyị ọtụtụ ihe banyere ma anyị hụrụ n'anya ma ọ bụ na anyị ahughị n'anya karịa ka mmetụta uche anyị si agwa anyị. Ọbụna mgbe anyị na-enyocha onwe anyị, echiche anyị dị mgbagọ. Anyị kpuru ìsì, anyị apụghịkwa ịhụ ụzọ. Anyị na-ele anya otu ihe ma ọ bụ abụọ nke ịchụ onwe onye n'àjà anyị nwere ike ime n'otu ụbọchị ma nke fọdụrụ n'ụbọchị na-agbaso echiche na ọchịchọ nke onwe anyị.
Gịnị ka omume gị na-ekwu?
Olee otú anyị ga-esi rute ezi ịhụnanya mgbe a mụrụ anyị ma zụlite anyị n'ime ụwa nke ọdịmma onwe onye na nke ịhụ onwe onye n'anya? Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe dị iche na ebee ka anyị ga-esi malite? Anyị aghaghị ilekwasị anya n’onye Chineke bụ, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. Ọ bụ Ya bụ isi iyi, ma ihe Ọ na-eme na onye Ọ bụ na-enye anyị nghọta kwesịrị ekwesị na nkọwa banyere ịhụnanya.
N'ikele Chineke, ịhụnanya Ya Ọ na-enye anyi agbakwasaghị ukwu na otu anyị si ru eru ma ọ bụ otu anyị erughị. Toonụ Chineke maka ebere Ya n'ihi na ọ dịghị onye n'ime anyị kwesịrị inwete ịhụ n'anya Ya. Ma site n'amara ka e nyeworo anyị ịhụnanya Ya n’ime Kraịst. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ma ebe ezi ịhụnanya si abịa. Na nzoputa, anyi natara ihunanya Ya, e nyekwara anyị ịhụnanya Ya site n'amara--site na Mmuọ Nsọ Ya. Ya mere anyị nwere ike:
ịhụ Chineke n'anya na
hụ ndị ọzọ n'anya.
Nke a pụtara na ịhụnanya bụ isi iyi nke omume anyị niile.
Ị̀ ma ịhụnanya Kraịst? Ị bụrụla onye natara ịhụnanya nke Chineke na nke Ọkpara Ya bụ Kraịst? Ị marala eziokwu nke ozi-ọma?
Onye-nwe-anyị chọrọ ka anyị jiri obi umeala banye n'ịhụnanya Ya ma nata ihunanya Ya. Ọ ga-ezute anyị n'ebe ọ bụla anyị nọ--na mwute, na ọñụ, na ndakpọ olileanya, na mmeri. Ọ chọrọ ka anyị mara na Ọ hụrụ anyị n’anya n’ezie. Ọ chọkwara ka anyị tụkwasị ịhụnanya Ya obi. Ka anyị jiri nchegbu anyị niile biakwute Ya, jiri egwu anyị niile biakwute Ya, jiri mmehie anyị niile biakwute Ya, na jiri nsogbu anyị niile biakwute Ya, ma dọba ha n’ụkwụ Ya ma n’ọnọdụ mgbanwe nata amara Ya, ebere Ya na ịhụnanya Ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![What Is True Love?](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapistaging.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans-staging%2F31668%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.
More