Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 10 NKE 12

Ọchịchọ Naanị Anyị Bụ Ezi Ihụnanya.

Ọ buru na ọchịcho anyi kasị bụ ịhụ Ya n'anya n'uju, anyị ga-atapara Ya n'ahụ na soro Ya n'uju. Iji soro Ya nke ọma, anyị ga-ebuli obe anyị ma tụfuo ndụ anyị iji bie ndụ nke Ya. Ichọ odinma nke onwe anyị bụ nke ga-anwụrịrị, nke ụzọ anyị, ọchịchọ anyị, ibuli elu anyị. Ọ bụ n'ọnwụ a, ọnwụ nke ichọ odinma nke onwe onye, ka ịhụnanya nke Kraịst na-abịa ndụ n'ime anyị. Anyị ga-elekwasiriri Ya anya--na bụghị onye ọzọ, na abughị ihe ọzọ—maka udo, nnabata, ihu ọma, nduzi, na uru. Anyị ga-achọtarịrị ọṅụ anyị niile n’ime Ya. Ọ ga-aburiri ụgwọ ọrụ dị ukwuu anyị. Anyị ga-adaberere n’ụzọ zuru ezu n’uru anyị tụrụ anya ya n’ime Ya. Anyị ga-ezu ike n’ime Onye-nwe-anyị, na abụghị n’ezi omume nke anyị. Anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị obi. N'ezie ọ bụrụ na anyị ahapụ ichọ odinma nke onwe anyị, ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-ezutekwu Kraịst n'uju.

Ihapụ ichọ odinma nke onwe anyị adighị mfe, ma e kwuwe. Ọ pụtara na anyị ga-ahapụrịrị ụzọ nke anyị, nghọta, ọchịchọ, uche, egwu, enweghị ntụkwasị obi, nsogbu, nchegbu, ihe ndị anyị ga-enwerịrị, wdg. Ka anyị na-ahapụkwu nkasi obi na ụzọ nke ụwa a, otú ahụ ka anyị ga-enwe ike ịrapakwuru na nkasi obi na ụzọ nke Kraịst. Ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ime Kraịst, otú ahụ ka anyị ga-adịkwu njikere ijere Ya ozi na ịta ahụhụ maka Ya, ma otú ahụ ka anyị agaghị-anọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a dọpụrụ n’ebe Ọ nọ. Ọñụ nke Onye-nwe-anyị bụ ike anyị.

Ọ bụrụ na anyị na-achọ ka Ya na ịhụnanya Ya ju anyị afọ, anyị ga-eje ije n'njikọta obi anyị ọnụ na nke Ya n'ụbọchị dum, n'agbanyeghị otú oké ifufe ahụ siri sie ike, ma ọ bụ otú ihe ndọpụ uche ahụ siri sie ike ma ọ bụ otú ọnwụnwa ahụ siri sie ike nke na-abịara anyị.

Echi anyị ga-ahụ ihe nke a dị ka n'omume, kwa ụbọchị kwa ụbọchị.

Itinye Eziokwu N'Obi: Họrọ otu ebe n'Akwụkwọ Nsọ nke ị ga-etinye n'obi iji mee ka uche gị dị ọhụrụ ma gbanwee obi gị.

Ịgbu Ịchọ Odinma Onwe Gị: Olee mmehie a na-ekwu maka ya kpọmkwem na ndụ gị site n'Akwụkwọ Nsọ nke ị depụtara? Pọl na-agwa anyị n'onu siri ike ka anyị yipụ onwe anyị ahụ di ochie.

Iwelite Eziokwu Ka Ọ Dị Ndụ: Yikwasị Onwe Gị Onwe Ọhụrụ--Kraịst. Olee mgbanwe kpọmkwem dị mkpa ị ga-eme n'echiche gị ma ọ bụ n'àgwà ma ọ bụ n'omume gị iji na-edo onwe gị n'okpuru Ya na iji tinye eziokwu Ya n'uche na n'obi gị?

Igodo: ụbọchị_Iri ụbọchị_Iri
Ụbọchị 9Ụbọchị 11

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

More

Anyị ga-achọ ikele Thistlebend maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org Igodo: ikike banyere atụmatụ a ikike banyere atụmatụ a