Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?Ihe Atụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 5 NKE 12

Ịhụnanya Na-Adị Mgbagọ

N'isoro St. Augustine anyị nwere ike ịsị na ịhụnanya kachasị. Ma n'isorokwa St. Augustine kwuo ọzọ anyị nwere ike rụtụ aka na ezi ihe nke Chineke na-enye na-agbagọ; nke ahụ bụ ezi nkọwa nke ihe ọjọọ bụ. Ya mere, ọbụna ịhụnanya na-agbagọ na-elekwasị anya na odinma onwe. Dị ka ndị mmehie, anyị na-elekwasị anya n'onwe anyị site n'otu anyị di, anyị bikwa n'ụwa nke na-elekwasị anya n'odinma onwe ya. Ka anyị na-elekwasị anya n'odinma onwe anyị, ịhụnanya Ya bụ ihe na-efụnahụ anyị.

Anyị achọghị ka ihe ziri ezi n'ihu anyị funahụ anyi n'ihi egwu ma ọ bụ mpako ma ọ bụ ekweghị ekwe. Anyị achọghị ịbị ndụ na-eme ihe ndi anyi che bụ ihe bara uru ma ruo na njedebe wee chọpụta na isi ihe dị mkpa funahụrụ anyị.

Otu ilu, nwere ọtụtụ nsughari nari iri kwa nari iri, na-adọ anyi aka n'nti n'ụzọ n'esighi ike na ihe ndị dị obere ekwesịrị ime mana e meghị ha n'ihi na ahụtara ha dị ka ihe na-adịghị mkpa nwere ike ịkpata nnukwu nsogbu na ihe a na-atụghị anya ya.

Maka enweghị ntu, e funahụrụ akpụkpọ ụkwụ,
Maka enweghị akpụkpọ ụkwụ, e funahụrụ ịnyịnya,
Maka ụkọ nke inyinya, e funahụrụ onye na-anya inyinya,
N'ihi ụkọ onye na-anya inyinya, e funahụrụ ozi,
N'ihi enweghi ozi, adara mba n'ọgụ,
Maka ụkọ ọgụ, agha ahụ bụ nke a na-emerịghị,
Maka ụkọ agha, e funahụrụ ala eze,

Maka ụkọ ntu, e funahụrụ uwa.

Anyị nwere ike buru ndị azopụtara ma banye n'eluigwe naanị ichọpụta na anyị ahụbeghị uju nke ịhụnanya Ya Ọ zubeere n'ụwa. Amy Carmichael na-ekerịta, sị: “Julian nke Norwich [n’afọ ndị 1300] dere, sị: ‘Ọ bụ uche Chineke ka anyị were nkasi obi Ya n’ụzọ dị ukwuu na n’ụzọ siri ike dị ka anyị pụrụ isi were ha, na kwa Ọ chọrọ ka anyị ghara iji nsogbu anyị kporo ihe otú anyị nwere ike, ma were ha dika ihe ndị na-abaghi uru. Ee, n'ihi na "ọñụ na-abịa n'ụtụtụ."'”

Samuel Rutherford na afọ ndị 300 sochirinu mechara dee, "Aghọtaghị m ụzọ nke ịhụnanya Kraist. A si na m ma ihe Ọ na-edebe maka m, agaraghị m inwe nkụda mmụọ otú ahụ.”

Ọ na-emetuta gi otu ọ si dị ndị nsọ ochie a? Ọ na-esiri anyị ike kwa mgbe kwa mgbe ịnata ịhụnanya a n'ụzọ zuru ezu, anyị a na-eche na anyị erughị eru, anyị ekwesighị ibu ndi a hụrụ n'anya, ma ọ bụ ndi a na ekwesighị inabata. Anyị nwere nghọta miri emi na mkpụrụ obi anyị na anyị nwere ike na-efunahụ isi ihe ahụ. Mana ọ bụrụ na anyị efunahụ isi ihe a, anyị ga-efunahụ ọtụtụ ngọzi na ohere Ọ nwere maka anyị, ugbu a na n'ọdịnihu.

Igodo: ụbọchị_ise ụbọchị_ise
Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

More

Anyị ga-achọ ikele Thistlebend maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org Igodo: ikike banyere atụmatụ a ikike banyere atụmatụ a