Ikike nke ntụzi akaIhe Atụ
Chineke wee gọzie ha
Ọ dị ọtụtụ nnukwu ugwu dị n'ụwa a Ekwensu ji emegide na emetụta omume ndị mmadụ n'ụzọ ndị mmadụ si na-ebi emekọrịta n'usoro iwu nke Ekwensu nọ dịka eze. Mana na mbido ụwa a kwadebere ya na mmadụ ga-abụ onye agọziri agọzi ma nwee ịchị isi na mmeri n'ụwa.
Chineke gọziri Adam site n'iwebata ya n'ogige nke Eden, Ebe ihe niile nke ọ ga-achọ na ndụ dị. Otu ngọzi pụtara ihe Adam kara inwe bụ osisi nke ndụ (Jenesis 2:7-17).
Ihe jigidere mmadụ inwe ikike ịchị isi na ntụzi aka bụ osisi nke ndụ. Mmadụ kara ị nwere obi ya niile tụkwasị n'ebe Chineke nọ, ma ọ bụrụ na ọ taghị mkpụrụ osisi nke ndụ, ma na ọ tụfuru ọnọdụ nke ikike ịchi isi mgbe ọ tara mkpụrụ osisi si n'osisi nke nghọta ihe ọma na ihe ọjọọ.
Mmadụ bụ nkwekọrịta nke otu atọ bụ ahụ, mkpụrụobi na mmụọ. Mmụọ ka enyere ọkwa ka ya na Chineke na, ngosipụta ya. Osisi nke ndụ kọwara nke ọma ndụ nke Chineke ma na osisi nghọta nke ihe oma na ihe ọjọọ kọwara nke ọma ụdịdị nke Ekwensu.
Mmadụ ịnọgide n'ime ikike ịchị isi, ọ ga-agba mbọ mgbe niile na-esepụghi aka ịzụ onwe ya nri sitere n'osisi nke ndụ site na mmụọ ya.
Atụmatụ Chineke n'ebe mmadụ nọ bụ ka o demie mmadụ ka mmiri site n'osisi nke ndụ, nke ga-abụ na mmadụ ga-egosi ma bụrụ ihe zuru oke nke ọma n'ihe niile n'ụwa. Na testament ọhụrụ, akwụkwọ nsọ kwuru maka iwu nke mmụọ nke ndụ (Ndi Rom 8:1-2). Iwu nke mmụọ nke ndụ ebe ọnọdụ mmadụ ka ọ bụrụ onye ga-elekọta ma bụrụkwa onye ga-ewere onwe ya medaa isi meri nke Ekwensu. Ya mere onye ọ bụla chọrọ ịnogide n'ikike ịchị isi ga-abụ mgbe niile na ọ na-aga ma na-ebi ndụ n'ime mmụọ.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ndị Galetia 5:16-18, Ndị Efesọs 4:27, Samuelu nke mbụ 15:22
Ekpere: Onye nwe m Jizọs, gbaa m ume oge niile ị ga-ije na ibi ndụ n'ime mmụọ n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nnyefe kpam kpam a na-arụtụ aka na mkpughe ikeke nke ntụzi aka enyere mmadụ na mbido okike. Ọdịda nke mmadụ butere nkewa n'ebe ikike a dị mana Kraịst bịara ka owechighaa ikeke nke ntụzi aka a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg