Ikike nke ntụzi akaIhe Atụ
Ọganihu Alaeze
Ikike ịchị isi mmeri bụ ikike nke ihu ọganihu alaeze Chineke n'eluụwa. Jizọs Kraịst n'ije ozi n'eluụwa iji weghachi mmadụ n'ọnọdụ ya, ya na-itinye n'ọrụ ihe a sị mmadụ mee maka ikike ịchị isi na mmeri.
Okwu a bụ 'ịchi isi' nwekwanụike nwere otu ụdị okwu gbara mgbọrọgwụ n'asụsụ Hibru - dịka ịchị ọchịchị, ịchị eze, ọbụ kwa alaeze. Ọ bụ mmadụ ka Chineke gbasoro were mebe alaeze ya n'eluụwa. Kemgbe ọdịda mmadụ n'ogige Eden, ihe kara dị Chineke n'obi bụ ka ọ buru ụzọ hiwe alaeze ya n'ime obi mmadụ ma n'eluụwa.
Agha dị n'etiti alaeze Chineke na nke ọchịchịrị hiwere isi n'ebe mmadụ nọ. Nkea bụ eziokwu maka na ọtụtụ obi mmeri i meriri ọ bụkwa etu ahụ ka ị ga-esi keta ọtụtụ alagasi ị ga-enweta. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya etu ha ga-esi mee maka ọganihu alaeze Chineke, mgbe ọ kụziiri ha etu esi ekpe ekpere, n'akwụkwọ Matiu 6:10, nke kwụ pụtara si Ka alaeze gị bịa, ka emee uche gị n'ụwaa dịka esi eme ya n'eluigwe.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ọganihu alaeze Chineke, anyị ga-agba mbọ yiri ngwa agha nke ndị nwere akọnuche. Ọ dịghị mfe Ekwensu na ndị ya e nye efe n'ụzọ. Ya mere ọ ga-abụ isi okwu nyere anyị. Anyị anaghị alụso Ekwensu ọgụ kama na-etinye ikike na mmeri Kraịst nke ọ nyere ndị nzukọ ya n'elu obe nke kavari.
I sonye ekpere ndị nke metụtara alaeze, bụ ụzọ eji eme maka ọganihu alaeze Chineke n'eluụwa. Anyị ga-abụ ndị dị ike n'ekpere ma wezụga onwe anyị n'ihe ọbụla na-ebute mmehie.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Abụ ọma 66:3, Matiu 28:18-19.
Ekpere: Chineke were m ka m bụrụ onye nke ga-enwe ikike igbasaa alaeze gi n'eluụwa n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nnyefe kpam kpam a na-arụtụ aka na mkpughe ikeke nke ntụzi aka enyere mmadụ na mbido okike. Ọdịda nke mmadụ butere nkewa n'ebe ikike a dị mana Kraịst bịara ka owechighaa ikeke nke ntụzi aka a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg