Ikike nke ntụzi akaIhe Atụ
Onye nọ na nche
Onye nche were ọrụ elekọta ihe maọbụ na-eche mmadụ. Ikike ịchị isi mmeri debere anyị n'ihe anyị kwesịrị ime dịka onye nche.
Mbụso agha niile nke Ekwesu na ebu n'eluụwa sitere n'ọdịda nke Adam mgbe ọ hapụrụ ihe ọ kwesịrị ime dika onye nche na nlekọta ụwa. (Jenesis 2:15). Akụkụ nke ikike ịchị isi nke mmeri maka mmadụ bụ ka ọ na-elekọta ma na-edozi ogige ụbi. Akwụkwọ nsọ Pita nke mbụ 5:8 gbara anyị ụme ka anyị nwe anya udo na-echekwa nche maka na onye iro anyị Ekwensu dịka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na ejeghari na-achọ onye ọ ga elomi.
Onye nche dịka onye Ụkọchukwu nke nọ n'ebe nchụ aja Chineke. Onye maara ka esi agwa Chineke okwu ka ọ were ike na-elekọta ihe niile nọ n'okpuru ya anya n'eluụwa. Ihe ọ n'okpuru ya maọbụ n'aka ya ịchekwa nwere ike bụrụ alụmdi na nwunye, ihe mwube gị, Ezinaụlọ gị, Ụlọ ọrụ gị dere gawaze. Ị tinye n'ọrụ ikike ịchị isi mmeri, mmadụ ga-amariri ụzọ nke ebe nchụàjà Chineke. Mgbe anyị bidoro tinyewe anya ịma njedebe ebe nchụàjà Chineke, anyị nwere ike ịtụwari atụmatụ onye iro zubere ebe anyị nọ.(Matiu 13:25)
Ọbụru na anyị ka ịchekwa ihe nrite nke Chineke n'eluụwa, anyị ga-ekuli mara ihe kwesịrị na anyị ga-eme dịka ndị nche. Anyị ga-abụ ndị na-akpakọ onwe anyị ọnụ. Mgbe onye nche maara ihe o kwesịrị ime ndị ododo ga-abụ ndị anapụtara (Izikel 22:30). Onye nche bụ onye na-anọ n'etiti ndị ọ na-achị na-arị ọ ma na-eweta mmụọ ọ ji ekpuchite ndị aha nyere ya n'aka.
Otu njirimara onye nche bụ ịdị ụmeala na inwe obi ọmịiko(Abụ ọma 25:9). Na testament ochie, onye Ụkọchukwu na-amụnye ọku n'ebe nchụàjà Chineke ma n'oge testament ọhụrụ, a kpọrọ ka anyị na-amụnye ọkụ ahụ n'obi anyị. Site n'esepụghi aka n'ekpere na ọlụ, anyị nwere ikike ịchekwa ụwa na itinye n'ọrụ ihe asị anyị mee maka ikike ịchị isi na mmeri.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Luk 18:1-7, Matiu 26:41,Ditoronomi 33:6
Ekpere: Onye nwe m Jizọs, e were m onwe m tinye n'ọrụ nke onye nche taa, site n'amara gị nyere m aka ka m soro tinye n'ọrụ ikike ịchị isi mmeri.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nnyefe kpam kpam a na-arụtụ aka na mkpughe ikeke nke ntụzi aka enyere mmadụ na mbido okike. Ọdịda nke mmadụ butere nkewa n'ebe ikike a dị mana Kraịst bịara ka owechighaa ikeke nke ntụzi aka a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg