Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikike nke ntụzi akaIhe Atụ

Ikike nke ntụzi aka

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Mụọnụ Ọmụmụ ma baanụ ụba

Ihe ikike nke mmeri chọrọ bụ na mmadụ ga-amụba ọmụmụ ma baa ụba. Mmụba na mbawanye bụ nka maọbụ akọ na uche maka ikike ịchị isi maọbụ mmeri. Mmadụ ọbụla ga-anọchite anya Chineke ga-aghọta iwu a na-agbaso maka ịmi mkpụrụ.

Iwu a na-agbaso maka ịmị mkpụrụ: Akwụkwọ nsọ nke Jọn 15:1-5 wepụtara ọnọdu iji uche hụ n'ime akwụkwọ nsọ iwu a na-agbaso maka ịmị mkpụrụ. Jọn 15:5 nke na-ekwu onye na-anọgide n'ime m mụ Onwe m kwa n'ime ya, onye ahụ na-amị mkpụrụ hienne n'ihi na e wezụga m ọ nweghị ihe unu pụrụ ime.

Ịmị mkpụrụ na-ebido na Chineke. Akwụkwọ nsọ kọwara Chineke nke ọma dịka mmụọ, ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ imi mkpụrụ, mmadụ ga-enwe mmekọrịta na Kraịst. Ọdịda nke mmadụ n'ogige nke Eden ọnwụ nke mmụọ nke mmadụ, ya mere o jiri sie ike mmadụ ịmị mkpụrụ n'ime mmụọ. Imi mkpụrụ n'ime mmụọ, a ga-emejupụta anyị n'ike site n'ibi ndụ ọhụrụ. Ọ bụ site n'usoro nke nzọpụta ka mmụọ nke mmadụ ji dịkwa ndụ ọzọ ma mịa mkpụrụ. (Ndị Kọrịnt 5:17).

Jizọs kọwara anyị usoro ịmụghari mmadụ ọzọ n'akwụkwọ Jọn 3:3-5 nke kwuru na-aga amughari mmadụ ọzọ site na mmiri na mmụọ nsọ. Nkea kọwara nke ọma ime mmiri Chukwu nke nchegharị ebe alara ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ n'iyi, ma bụrụ onye amụghari na mmụọ nsọ nke na-amụta mkpụrụ nke ndụ n'ime mmụọ. E wezụga Kraịst, ịmị mkpụrụ gaara abụ ihe enweghị isi.

Ihe ọzọ dị mkpa maka iwu a na-agbaso maka ịmị mkpụrụ bụ mmiri ozizo nke mmụọ. N'akwụkwọ Isaiah 32:15 kwuru sị ; Rue mgbe aga-awụkwasị anyị mmụọ site n'elu, ọzara ewee ghọọ ụbị ọma, a ga-agukwa ụbịoma/mkpụrụ ọma n'oke ọhịa. Mmiri ozizo nke mmụọ bụ nwụsa na mmeju nke mmụọ nsọ.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ọlu ndị ozi 2 :1-4, Ndi Galeshia 5:19-25.

Ekpere: O Chineke nna, nyere m aka, ịmị mkpụrụ na ihe niile n'eme n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ikike nke ntụzi aka

Nnyefe kpam kpam a na-arụtụ aka na mkpughe ikeke nke ntụzi aka enyere mmadụ na mbido okike. Ọdịda nke mmadụ butere nkewa n'ebe ikike a dị mana Kraịst bịara ka owechighaa ikeke nke ntụzi aka a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg